Levitikọs 22

Onyenwe anyị sịrị Mosis,

Leviticus 22:26 (UKJV) And the LORD spoke unto Moses, saying,

24Unu agaghị enye anụmanụ ọbụla nke mkpụrụ amụ ya chipịara echipịa, maọbụ nke pịara apịa, maọbụ nke a dọwapụrụ adọwapụ maọbụ nke a chakapụrụ achakapụ, dịka onyinye nʼihu Onyenwe anyị. Unu enyekwala ụdị onyinye a nʼala unu.

25Unu esitekwala nʼaka onye ọbịa nata ụdị onyinye a, ma webata ya dịka nri a na-enye Chineke unu. A gaghị anabata ha nʼọnọdụ unu, nʼihi na ha nwere nkwarụ, nwekwa ntụpọ.’ ”

26Onyenwe anyị sịrị Mosis,

27“Mgbe a mụrụ nwa ehi, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ ewu ọhụrụ, a ga-ahapụ ya na nne ya ụbọchị asaa. Site nʼụbọchị nke asatọ gaa nʼihu a ga-anabata ya dịka onyinye ihe oriri i ji chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.

28Egbula nne anụ na nwa ya nʼotu ụbọchị, maọbụ ehi maọbụ atụrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.