25Unu esitekwala nʼaka onye ọbịa nata ụdị onyinye a, ma webata ya dịka nri a na-enye Chineke unu. A gaghị anabata ha nʼọnọdụ unu, nʼihi na ha nwere nkwarụ, nwekwa ntụpọ.’ ”
26Onyenwe anyị sịrị Mosis,
27“Mgbe a mụrụ nwa ehi, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ ewu ọhụrụ, a ga-ahapụ ya na nne ya ụbọchị asaa. Site nʼụbọchị nke asatọ gaa nʼihu a ga-anabata ya dịka onyinye ihe oriri i ji chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
28Egbula nne anụ na nwa ya nʼotu ụbọchị, maọbụ ehi maọbụ atụrụ.
29“Mgbe unu na-achụrụ Onyenwe anyị aja ekele, chụọnụ ya nʼụzọ ahụ a ga-anabata ya.