Levitikọs 22

Unu esitekwala nʼaka onye ọbịa nata ụdị onyinye a, ma webata ya dịka nri a na-enye Chineke unu. A gaghị anabata ha nʼọnọdụ unu, nʼihi na ha nwere nkwarụ, nwekwa ntụpọ.’ ”

Leviticus 22:25 (UKJV) Neither from a stranger's hand shall all of you offer the bread of your God of any of these; because their corruption is in them, and blemishes be in them: they shall not be accepted for you.

23Unu nwere ike jiri ehi maọbụ atụrụ nke akụkụ ahụ ya tara ata, maọbụ nke otu akụkụ ya buru ibu karịa ibe ya chụọ aja onyinye si nʼobi, ma a gaghị e ji ya chụọ aja imezu nkwa.

24Unu agaghị enye anụmanụ ọbụla nke mkpụrụ amụ ya chipịara echipịa, maọbụ nke pịara apịa, maọbụ nke a dọwapụrụ adọwapụ maọbụ nke a chakapụrụ achakapụ, dịka onyinye nʼihu Onyenwe anyị. Unu enyekwala ụdị onyinye a nʼala unu.

25Unu esitekwala nʼaka onye ọbịa nata ụdị onyinye a, ma webata ya dịka nri a na-enye Chineke unu. A gaghị anabata ha nʼọnọdụ unu, nʼihi na ha nwere nkwarụ, nwekwa ntụpọ.’ ”

26Onyenwe anyị sịrị Mosis,

27“Mgbe a mụrụ nwa ehi, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ ewu ọhụrụ, a ga-ahapụ ya na nne ya ụbọchị asaa. Site nʼụbọchị nke asatọ gaa nʼihu a ga-anabata ya dịka onyinye ihe oriri i ji chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.