5maọbụ na o metụrụ anụ na-akpụgharị akpụgharị nʼala aka, nke na-emerụ ya, maọbụ na ọ metụrụ mmadụ aka nke mere ka ọ bụrụ onye rụrụ arụ nʼagbanyeghị ihe ọ bụ na-emerụ ya.
6Onye ahụ metụrụ ihe ndị a aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ gaghị eri ihe nsọ ọbụla tutu ruo mgbe ọ sachara ahụ.
7Mgbe anyanwụ dara ka ọ ga-adị ọcha, nweekwa ike iri ihe dị nsọ, nʼihi na ọ bụ nri ya.
8Ọ gaghị eri anụ nwụrụ anwụ, maọbụ nke anụ ọzọ dọgburu, nʼihi na ihe ndị a ga-emerụ ya. Abụ m Onyenwe anyị.
9“ ‘Ndị nchụaja kwesiri idebe ụkpụrụ m, ka ha ghara ịbụ ndị ikpe mara si otu a nwụọ nʼihi na ha lelịrị ha anya. Abụ m Onyenwe anyị onye na-edo ha nsọ.