Levitikọs 22

Onye ahụ metụrụ ihe ndị a aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ gaghị eri ihe nsọ ọbụla tutu ruo mgbe ọ sachara ahụ.

Leviticus 22:6 (UKJV) The soul which has touched any such shall be unclean until even, and shall not eat of the holy things, unless he wash his flesh with water.

4“ ‘Onye ọbụla bụ nwa nwa Erọn nke ọrịa ekpenta na-arịa, maọbụ nke ihe si nʼahụ ya na-asọpụta agaghị eri aja dị nsọ tutu ruo mgbe e mere ka ọ dịrị ọcha. Ọ ga-abụkwa onye rụrụ arụ ma ọ bụrụ na o metụ ozu aka, maọbụ onye mkpụrụ nwa na-esite nʼahụ awụsị,

5maọbụ na o metụrụ anụ na-akpụgharị akpụgharị nʼala aka, nke na-emerụ ya, maọbụ na ọ metụrụ mmadụ aka nke mere ka ọ bụrụ onye rụrụ arụ nʼagbanyeghị ihe ọ bụ na-emerụ ya.

6Onye ahụ metụrụ ihe ndị a aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ gaghị eri ihe nsọ ọbụla tutu ruo mgbe ọ sachara ahụ.

7Mgbe anyanwụ dara ka ọ ga-adị ọcha, nweekwa ike iri ihe dị nsọ, nʼihi na ọ bụ nri ya.

8Ọ gaghị eri anụ nwụrụ anwụ, maọbụ nke anụ ọzọ dọgburu, nʼihi na ihe ndị a ga-emerụ ya. Abụ m Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.