Levitikọs 22

Ọ gaghị eri anụ nwụrụ anwụ, maọbụ nke anụ ọzọ dọgburu, nʼihi na ihe ndị a ga-emerụ ya. Abụ m Onyenwe anyị.

Leviticus 22:8 (UKJV) That which dies of itself, or is torn with beasts, he shall not eat to defile himself therewith; I am the LORD.

6Onye ahụ metụrụ ihe ndị a aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ gaghị eri ihe nsọ ọbụla tutu ruo mgbe ọ sachara ahụ.

7Mgbe anyanwụ dara ka ọ ga-adị ọcha, nweekwa ike iri ihe dị nsọ, nʼihi na ọ bụ nri ya.

8Ọ gaghị eri anụ nwụrụ anwụ, maọbụ nke anụ ọzọ dọgburu, nʼihi na ihe ndị a ga-emerụ ya. Abụ m Onyenwe anyị.

9“ ‘Ndị nchụaja kwesiri idebe ụkpụrụ m, ka ha ghara ịbụ ndị ikpe mara si otu a nwụọ nʼihi na ha lelịrị ha anya. Abụ m Onyenwe anyị onye na-edo ha nsọ.

10“ ‘O nweghị onye ọbụla na-esiteghị nʼezinaụlọ ndị nchụaja ga-eri aja nsọ ahụ. Onye bụ ọbịa na onye e goro ọrụ nọ nʼụlọ onye nchụaja agaghị eri ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.