Levitikọs 23

“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Ndị a bụ mmemme a kara aka nye Onyenwe anyị, nke unu ga-ekwusa dịka mkpọkọta dị nsọ.

Leviticus 23:2 (UKJV) Speak unto the children of Israel, and say unto them, Concerning the feasts of the LORD, which all of you shall proclaim to be holy convocations, even these are my feasts.

1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,

2“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Ndị a bụ mmemme a kara aka nye Onyenwe anyị, nke unu ga-ekwusa dịka mkpọkọta dị nsọ.

3“ ‘Ụbọchị isii ka unu ga-eji rụọ ọrụ. Ma ụbọchị nke asaa, bụ ụbọchị izuike, ụbọchị mkpọkọta dị nsọ. Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, nʼebe ọbụla unu bi. Ọ bụ ụbọchị izuike nye Onyenwe anyị.

4“ ‘Ndị a bụ mmemme Onyenwe anyị a kara aka, mkpọkọta dị nsọ nke unu ga-ekwusa nʼoge a kara aka.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.