1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼugwu Saịnaị sị ya,
2“Gwa ụmụ Izrel sị ha, ‘Mgbe unu batara nʼala ahụ m ga-enye unu, unu ga-eme ka ala ahụ nwee afọ izuike nke ya nye Onyenwe anyị.
3Afọ isii ka unu ga-akụ ihe nʼubi, afọ isii ka unu ga-ewe ihe ubi, kwachaakwa alaka osisi vaịnị unu.
4Ma mgbe o ruru afọ nke asaa, unu ga-ahapụ ala ubi unu ka o zuo ike, afọ izuike nye Onyenwe anyị. Unu akụla ihe ọbụla nʼubi unu maọbụ kwachaa osisi vaịnị unu.