Levitikọs 25

Afọ isii ka unu ga-akụ ihe nʼubi, afọ isii ka unu ga-ewe ihe ubi, kwachaakwa alaka osisi vaịnị unu.

Leviticus 25:3 (UKJV) Six years you shall sow your field, and six years you shall prune your vineyard, and gather in the fruit thereof;

1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼugwu Saịnaị sị ya,

2“Gwa ụmụ Izrel sị ha, ‘Mgbe unu batara nʼala ahụ m ga-enye unu, unu ga-eme ka ala ahụ nwee afọ izuike nke ya nye Onyenwe anyị.

3Afọ isii ka unu ga-akụ ihe nʼubi, afọ isii ka unu ga-ewe ihe ubi, kwachaakwa alaka osisi vaịnị unu.

4Ma mgbe o ruru afọ nke asaa, unu ga-ahapụ ala ubi unu ka o zuo ike, afọ izuike nye Onyenwe anyị. Unu akụla ihe ọbụla nʼubi unu maọbụ kwachaa osisi vaịnị unu.

5Unu agaghị ewe ihe ubi ọbụla ga-epupụtara onwe ha nʼoge a, maọbụ tụtụọ mkpụrụ osisi vaịnị ndị ga-ada ada. Nʼihi na afọ ahụ bụ afọ ozuzu ike dịrị ala ubi niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.