Levitikọs 25

Unu agaghị ewe ihe ubi ọbụla ga-epupụtara onwe ha nʼoge a, maọbụ tụtụọ mkpụrụ osisi vaịnị ndị ga-ada ada. Nʼihi na afọ ahụ bụ afọ ozuzu ike dịrị ala ubi niile.

Leviticus 25:5 (UKJV) That which grows of its own accord of your harvest you shall not reap, neither gather the grapes of your vine undressed: for it is a year of rest unto the land.

3Afọ isii ka unu ga-akụ ihe nʼubi, afọ isii ka unu ga-ewe ihe ubi, kwachaakwa alaka osisi vaịnị unu.

4Ma mgbe o ruru afọ nke asaa, unu ga-ahapụ ala ubi unu ka o zuo ike, afọ izuike nye Onyenwe anyị. Unu akụla ihe ọbụla nʼubi unu maọbụ kwachaa osisi vaịnị unu.

5Unu agaghị ewe ihe ubi ọbụla ga-epupụtara onwe ha nʼoge a, maọbụ tụtụọ mkpụrụ osisi vaịnị ndị ga-ada ada. Nʼihi na afọ ahụ bụ afọ ozuzu ike dịrị ala ubi niile.

6Ihe ubi puputara nʼala ahụ niile nʼafọ izuike ahụ bụ nri dịrị unu onwe unu, na ndị odibo nwoke na nwanyị unu niile, na onye i goro ọrụ, na onye ọbịa bi nʼetiti unu.

7Ihe ubi ahụ dịkwara anụ ụlọ gị, na anụ ọhịa bi nʼala gị. Ihe ọbụla puputara nʼala bụ ihe unu ga-eri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.