24Nʼala obibi unu niile, unu ga-enye ohere maka mgbapụta ala erere ere.
25“ ‘Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu aghọọ onye ogbenye si otu a ree ala ya, nwanna ya dị ya nso ga-abịa gbapụta ala ahụ.
26Ọ bụrụ na-enweghị onye ga-agbapụta ala ahụ nye ha, ma ha mesịa ghọọ ndị bara ụba nwekwa ihe ga-ezu ịgbapụta ala ahụ nʼonwe ha.
27A ga-agụ afọ ole gara site na mgbe o rere ala ahụ, nyeghachi ya ego ole o kwesiri inweta. Onye rere ala ga-alaghachikwa nʼala ya.
28Ọ bụrụ na onyenwe ya enweghị ike ịchọta ego ọ ga-eji gbara ya, ala ahụ ga-adị nʼaka onye ahụ zụrụ ya tutu ruo nʼafọ inwere onwe. Mgbe ahụ ọ ga-ewerekwa ala ahụ nyeghachi ya onye resiri ya.