22Mgbe unu ga-akụ ihe ubi nʼafọ nke asatọ unu ga na-eri site nʼowuwe ihe ubi ochie unu tutu ruo nʼafọ nke itoolu mgbe unu ga-ewebata ihe ubi ọhụrụ.
23“ ‘Chetanụ na ala bụ nke m, nʼihi nke a, o kwesighị ka unu ree ala ọbụla kpamkpam. Unu bụ naanị ndị ọbịa na ndị nlekọta nye m.
24Nʼala obibi unu niile, unu ga-enye ohere maka mgbapụta ala erere ere.
25“ ‘Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu aghọọ onye ogbenye si otu a ree ala ya, nwanna ya dị ya nso ga-abịa gbapụta ala ahụ.
26Ọ bụrụ na-enweghị onye ga-agbapụta ala ahụ nye ha, ma ha mesịa ghọọ ndị bara ụba nwekwa ihe ga-ezu ịgbapụta ala ahụ nʼonwe ha.