26Ọ bụrụ na-enweghị onye ga-agbapụta ala ahụ nye ha, ma ha mesịa ghọọ ndị bara ụba nwekwa ihe ga-ezu ịgbapụta ala ahụ nʼonwe ha.
27A ga-agụ afọ ole gara site na mgbe o rere ala ahụ, nyeghachi ya ego ole o kwesiri inweta. Onye rere ala ga-alaghachikwa nʼala ya.
28Ọ bụrụ na onyenwe ya enweghị ike ịchọta ego ọ ga-eji gbara ya, ala ahụ ga-adị nʼaka onye ahụ zụrụ ya tutu ruo nʼafọ inwere onwe. Mgbe ahụ ọ ga-ewerekwa ala ahụ nyeghachi ya onye resiri ya.
29“ ‘Onye ọbụla rere ụlọ obibi dị nʼobodo e ji mgbidi gbaa gburugburu nwere ikike mgbapụta ya naanị mgbe otu afọ zuru site na mgbe e rere ya. Nʼoge ahụ ka onye rere ya nwere ike ịgbaghachi ya.
30Ọ bụrụ na a gbapụtaghị ya tupu otu afọ agafee, ụlọ ahụ dị nʼime obodo nwere mgbidi ga-abụ nke onye ahụ zụrụ ya mgbe niile, bụrụkwa nke ụmụ ụmụ ya. A gaghị enyeghachikwa ya mgbe afọ inwere onwe ruru.