28Ọ bụrụ na onyenwe ya enweghị ike ịchọta ego ọ ga-eji gbara ya, ala ahụ ga-adị nʼaka onye ahụ zụrụ ya tutu ruo nʼafọ inwere onwe. Mgbe ahụ ọ ga-ewerekwa ala ahụ nyeghachi ya onye resiri ya.
29“ ‘Onye ọbụla rere ụlọ obibi dị nʼobodo e ji mgbidi gbaa gburugburu nwere ikike mgbapụta ya naanị mgbe otu afọ zuru site na mgbe e rere ya. Nʼoge ahụ ka onye rere ya nwere ike ịgbaghachi ya.
30Ọ bụrụ na a gbapụtaghị ya tupu otu afọ agafee, ụlọ ahụ dị nʼime obodo nwere mgbidi ga-abụ nke onye ahụ zụrụ ya mgbe niile, bụrụkwa nke ụmụ ụmụ ya. A gaghị enyeghachikwa ya mgbe afọ inwere onwe ruru.
31Ma ụlọ ndị dị nʼobodo nta na-enweghị mgbidi a ga-agụ ha dịka ihe dị nʼọhịa. E nwere ike ịgbapụta ha, ha bụkwa nke a ga-eweghachite mgbe afọ inwere onwe ruru.
32“ ‘Ma banyere obodo niile nke ndị Livayị dị iche iche. Ha nwere ikike ịgbapụta ụlọ ha dị nʼime nketa ha mgbe ọbụla.