37Ị gaghị ana ọmụrụnwa nʼego i gbazinyere ha, maọbụ rie uru site na nri i resiri ha.
38Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, inye unu ala Kenan, na ị bụ Chineke unu.
39“ ‘Ọ bụrụ na onye Izrel ọbụla adaa ogbenye, resi gị onwe ya, emela ka o jere gị ozi dịka onye ohu.
40Kama ị ga-emeso ya mmeso dịka ị ga-esi meso onye ọrụ e goro ego, maọbụ dịka onye ọbịa nọ nʼetiti unu. Ọ ga-ejere gị ozi tutu ruo afọ inwere onwe.
41Nʼafọ ahụ, ị ga-ahapụ ha na ụmụ ha ka ha laghachikwuru ndị ikwu ha, si otu a nwetaghachi ala ubi dị nʼezinaụlọ ha.