Levitikọs 25

“ ‘Gụpụta afọ izuike asaa, afọ asaa, ụzọ asaa. Ngụkọ afọ izuike ndị a niile ga-enye iri afọ anọ na itoolu.

Leviticus 25:8 (UKJV) And you shall number seven sabbaths of years unto you, seven times seven years; and the space of the seven sabbaths of years shall be unto you forty and nine years.

6Ihe ubi puputara nʼala ahụ niile nʼafọ izuike ahụ bụ nri dịrị unu onwe unu, na ndị odibo nwoke na nwanyị unu niile, na onye i goro ọrụ, na onye ọbịa bi nʼetiti unu.

7Ihe ubi ahụ dịkwara anụ ụlọ gị, na anụ ọhịa bi nʼala gị. Ihe ọbụla puputara nʼala bụ ihe unu ga-eri.

8“ ‘Gụpụta afọ izuike asaa, afọ asaa, ụzọ asaa. Ngụkọ afọ izuike ndị a niile ga-enye iri afọ anọ na itoolu.

9Nʼụbọchị nke iri nke ọnwa asaa, zipụ onye ga-egbu opi ike, ya bụ, nʼụbọchị mkpuchi mmehie, a ga-egbu opi ike nʼala Izrel niile.

10Doonụ afọ nke iri ise ahụ nsọ, kwusaakwa inwere onwe nye mmadụ niile nʼala ahụ niile. Afọ ahụ ga-abụ afọ inwere onwe nye unu. Onye ọbụla nʼime unu ga-alaghachi nʼihe onwunwe nke ezinaụlọ ya, onye ọbụla kwa ga-alaghachi nʼagbụrụ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.