Levitikọs 26

“ ‘Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige m ntị, jụkwa imezu ihe ndị a m nyere unu iwu ya,

Leviticus 26:14 (UKJV) But if all of you will not hearken unto me, and will not do all these commandments;

12Aga m ejegharị nʼetiti unu, bụrụ Chineke unu, unu ga-abụkwa ndị m.

13Nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, ka unu ghara ịbụ ndị ohu ọzọ. Etijiela m mkpọrọ igwe nke ịbụ ohu unu, mee ka unu bụrụ ndị ji nganga ejegharị.

14“ ‘Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige m ntị, jụkwa imezu ihe ndị a m nyere unu iwu ya,

15ọ bụrụ na unu ajụ ịgbaso ụkpụrụ m, sọọ iwu m ndị a oyi, si otu a mebie ọgbụgba ndụ m,

16mgbe ahụ, aga m eme ka oke ụjọ, na ọrịa na-ebibi ebibi, na ahụ ọkụ, bịakwasị unu. Ọrịa ndị a ga-eme ka anya unu daa mba, ọ ga-eripịakwa anụ ahụ unu. Unu ga-akụ mkpụrụ ubi nʼubi unu ma ndị iro unu ga-eri ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.