11Aga m eme ka ebe obibi m dịrị nʼetiti unu. Agaghị m asọ unu oyi.
12Aga m ejegharị nʼetiti unu, bụrụ Chineke unu, unu ga-abụkwa ndị m.
13Nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, ka unu ghara ịbụ ndị ohu ọzọ. Etijiela m mkpọrọ igwe nke ịbụ ohu unu, mee ka unu bụrụ ndị ji nganga ejegharị.
14“ ‘Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige m ntị, jụkwa imezu ihe ndị a m nyere unu iwu ya,
15ọ bụrụ na unu ajụ ịgbaso ụkpụrụ m, sọọ iwu m ndị a oyi, si otu a mebie ọgbụgba ndụ m,