Levitikọs 26

ọ bụrụ na unu ajụ ịgbaso ụkpụrụ m, sọọ iwu m ndị a oyi, si otu a mebie ọgbụgba ndụ m,

Leviticus 26:15 (UKJV) And if all of you shall despise my statutes, or if your soul detest my judgments, so that all of you will not do all my commandments, but that all of you break my covenant:

13Nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, ka unu ghara ịbụ ndị ohu ọzọ. Etijiela m mkpọrọ igwe nke ịbụ ohu unu, mee ka unu bụrụ ndị ji nganga ejegharị.

14“ ‘Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige m ntị, jụkwa imezu ihe ndị a m nyere unu iwu ya,

15ọ bụrụ na unu ajụ ịgbaso ụkpụrụ m, sọọ iwu m ndị a oyi, si otu a mebie ọgbụgba ndụ m,

16mgbe ahụ, aga m eme ka oke ụjọ, na ọrịa na-ebibi ebibi, na ahụ ọkụ, bịakwasị unu. Ọrịa ndị a ga-eme ka anya unu daa mba, ọ ga-eripịakwa anụ ahụ unu. Unu ga-akụ mkpụrụ ubi nʼubi unu ma ndị iro unu ga-eri ha.

17Aga m eguzo megide unu nʼoge ibu agha, mee ka ndị iro unu merie unu nʼagha. Unu ga-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ unu ọsọ. Ndị kpọrọ unu asị ga-achịkwa unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.