Levitikọs 26

Unu ga-adọgbu onwe unu nʼọrụ nʼefu, nʼihi na ala unu agaghị emepụtara unu ihe omume ya, osisi nke ala unu agaghị amịkwa mkpụrụ ya.

Leviticus 26:20 (UKJV) And your strength shall be spent in vain: for your land shall not yield her increase, neither shall the trees of the land yield their fruits.

18“ ‘Ọ bụrụ na unu anọgidesie ike ju ige m ntị nʼagbanyeghị ihe ndị a, aga m enye unu ntaramahụhụ dị okpukpu asaa nʼihi mmehie unu.

19Aga m etiji ịnya isi nganga unu, mee ka mbara eluigwe dịịrị unu dịka igwe, elu ala unu na-azọkwasị ụkwụ ga-adịkwa dịka bronz.

20Unu ga-adọgbu onwe unu nʼọrụ nʼefu, nʼihi na ala unu agaghị emepụtara unu ihe omume ya, osisi nke ala unu agaghị amịkwa mkpụrụ ya.

21“ ‘Ọ bụrụkwa na mgbe nke a mesịrị, unu anọgidekwa jụ ime ihe m nyere nʼiwu, aga m eme ka ntaramahụhụ unu dịrị ukwuu, ugboro asaa ọzọ, nʼihi mmehie unu.

22Aga m ezite anụ ọhịa megide unu. Ha ga-adọgbu ụmụ unu, bibie anụ ụlọ unu, meekwa ka unu dị nta nʼọnụọgụgụ, ruo na ndị a ga-ahụ nʼokporoụzọ unu ga-adị ole na ole.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.