Levitikọs 26

“ ‘Ọ bụrụkwa na mgbe nke a mesịrị, unu anọgidekwa jụ ime ihe m nyere nʼiwu, aga m eme ka ntaramahụhụ unu dịrị ukwuu, ugboro asaa ọzọ, nʼihi mmehie unu.

Leviticus 26:21 (UKJV) And if all of you walk contrary unto me, and will not hearken unto me; I will bring seven times more plagues upon you according to your sins.

19Aga m etiji ịnya isi nganga unu, mee ka mbara eluigwe dịịrị unu dịka igwe, elu ala unu na-azọkwasị ụkwụ ga-adịkwa dịka bronz.

20Unu ga-adọgbu onwe unu nʼọrụ nʼefu, nʼihi na ala unu agaghị emepụtara unu ihe omume ya, osisi nke ala unu agaghị amịkwa mkpụrụ ya.

21“ ‘Ọ bụrụkwa na mgbe nke a mesịrị, unu anọgidekwa jụ ime ihe m nyere nʼiwu, aga m eme ka ntaramahụhụ unu dịrị ukwuu, ugboro asaa ọzọ, nʼihi mmehie unu.

22Aga m ezite anụ ọhịa megide unu. Ha ga-adọgbu ụmụ unu, bibie anụ ụlọ unu, meekwa ka unu dị nta nʼọnụọgụgụ, ruo na ndị a ga-ahụ nʼokporoụzọ unu ga-adị ole na ole.

23“ ‘Ọ bụrụkwa na unu anọgide jụ ịdọ aka na ntị m, chie ntị nọgide na-ebu agha nnupu isi unu megide m,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.