21“ ‘Ọ bụrụkwa na mgbe nke a mesịrị, unu anọgidekwa jụ ime ihe m nyere nʼiwu, aga m eme ka ntaramahụhụ unu dịrị ukwuu, ugboro asaa ọzọ, nʼihi mmehie unu.
22Aga m ezite anụ ọhịa megide unu. Ha ga-adọgbu ụmụ unu, bibie anụ ụlọ unu, meekwa ka unu dị nta nʼọnụọgụgụ, ruo na ndị a ga-ahụ nʼokporoụzọ unu ga-adị ole na ole.
23“ ‘Ọ bụrụkwa na unu anọgide jụ ịdọ aka na ntị m, chie ntị nọgide na-ebu agha nnupu isi unu megide m,
24mụ onwe m ga-ebu agha megide unu. Aga m eti unu ugbo ihe otiti asaa, nʼihi mmehie unu.
25Aga m ewebata mma agha nʼebe unu nọ, ịbọ ọbọ nʼihi ọgbụgba ndụ m unu mebiri. Mgbe unu ga-agba ọsọ gbaba nʼobodo unu, aga m ezite ihe mbibi ga-ebibi unu nʼebe ahụ. Aga m enyefekwa unu nʼaka ndị iro unu.