25Aga m ewebata mma agha nʼebe unu nọ, ịbọ ọbọ nʼihi ọgbụgba ndụ m unu mebiri. Mgbe unu ga-agba ọsọ gbaba nʼobodo unu, aga m ezite ihe mbibi ga-ebibi unu nʼebe ahụ. Aga m enyefekwa unu nʼaka ndị iro unu.
26Aga m eme ka unu hapụ inwe ihe oriri ga-ezuru unu. Otu ite nri naanị ka ndị inyom iri ga-eji sie nri ha nwere. Ha ga-eji ihe ọtụtụ tụọ ya mgbe ha na-eke ya. Unu ga-eri ya, ma afọ agaghị eju unu.
27“ ‘Ọ bụrụkwa na unu agaa nʼihu jụ ige m ntị nʼagbanyeghị ihe ndị a, nọgide na-emegide m,
28mgbe ahụ, aga m egosi unu oke iwe m, nye unu ntaramahụhụ dị okpukpu asaa nʼihi mmehie unu.
29Unu ga-eri anụ ụmụ unu ndị ikom, na anụ ụmụ unu ndị inyom.