31Aga m eme ka obodo unu niile tọgbọrọ nʼefu, kụdasịakwa ebe nsọ unu niile. Agaghị m anabatakwa isisi ụtọ nke aja unu.
32Aga m eme ka ala unu tọgbọrọ nʼefu, mee ka ọnọdụ ịdị ala unu bụrụ ihe ga-eju ndị iro unu ga-ebi nʼime ya anya.
33Aga m achụsa unu na mba niile, mịpụta mma agha m jiri ya chụso unu ọsọ. Ala unu ga-atọgbọrọ nʼefu, a ga-etikpọkwa obodo unu niile.
34Mgbe ahụ, ala ahụ ga-ezu ike, ogologo oge ndị ahụ niile ọ ga-atọgbọrọ nʼefu. Mgbe unu ga-anọ dịka ndị ohu nʼala ndị iro unu. Ala ahụ ga-ezu ike, imejupụta afọ izuike ya niile.
35Ogologo oge niile ala ahụ tọgbọrọ nʼefu, ala ahụ ga-ezu ike, ụdị izuike ọ na-enweghị nʼafọ izuike ndị ahụ unu bi nʼime ya.