Levitikọs 27

Ọ bụrụ na onye nwe anụ ụlọ ahụ achọọ ịgbara ya, ọ ga-akwụ ụgwọ anụ ụlọ ahụ, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa anụ ụlọ ahụ.

Leviticus 27:13 (UKJV) But if he will at all redeem it, then he shall add a fifth part thereof unto your estimation.

11Ọ bụrụ na anụ ụlọ o ji kwee nkwa bụ anụ ụlọ rụrụ arụ, ụdị anụ ụlọ ahụ a jụrụ ịnabata dịka onyinye maka iji ya chụọ aja nye Onyenwe anyị, a ga-akpụtara onye nchụaja anụ ụlọ ahụ.

12Ọ bụ ya ka ọ dịrị ikpebi ma anụ ụlọ ahụ ọ dị mma, ma ọ jọrọ njọ. Ọnụ ego ọbụla onye nchụaja kpebiri, ka onye wetara anụ ụlọ ahụ ga-akwụ.

13Ọ bụrụ na onye nwe anụ ụlọ ahụ achọọ ịgbara ya, ọ ga-akwụ ụgwọ anụ ụlọ ahụ, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa anụ ụlọ ahụ.

14“ ‘Ọ bụrụ na mmadụ enye ụlọ ya, dịka ihe ga-adị nsọ nye Onyenwe anyị, onye nchụaja ga-ekpebi maọbụ ụlọ dị mma, ma ọ bụkwanụ ụlọ jọrọ njọ. Ọ ga-ekwukwa ihe bụ ọnụahịa ụlọ ahụ.

15Ọ bụrụ na onye ahụ nke na-edo ụlọ ya nsọ achọọ ịgbara ya, ọ ga-akwụ ọnụahịa ụlọ ahụ, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ụlọ ahụ. Emesịa, ụlọ ahụ ga-abụkwa nke ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.