Levitikọs 4

“ ‘Ọ bụrụ na nzukọ Izrel niile emehie na-amaghị ama, mee ihe ọbụla megidere ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu nke a na-adịghị eme eme, ọ bụ ezie na ndị obodo amaghị okwu a, mgbe ha ghọtara ikpe ọmụma ha

Leviticus 4:13 (UKJV) And if the whole congregation of Israel sin through ignorance, and the thing be hid from the eyes of the assembly, and they have done somewhat against any of the commandments of the LORD concerning things which should not be done, and are guilty;

11Ma akpụkpọ anụ oke ehi ahụ na ahụ ya niile, ma isi ya, na ụkwụ ya, na ihe dị nʼime afọ ya, na mgbịrị afọ ya,

12ihe niile fọdụrụ nʼoke ehi ahụ, ka a ga-ebupu nʼazụ ebe obibi ụmụ Izrel, ebe dị ọcha, ebe a na-ekpofu ntụ. Ebe ahụ ka a ga-anọ kpọọ ya ọkụ, nʼọkụ a kwanyere nʼebe a na-ekpofu ntụ.

13“ ‘Ọ bụrụ na nzukọ Izrel niile emehie na-amaghị ama, mee ihe ọbụla megidere ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu nke a na-adịghị eme eme, ọ bụ ezie na ndị obodo amaghị okwu a, mgbe ha ghọtara ikpe ọmụma ha

14matakwa mmehie ha mehiere, nzukọ ahụ aghaghị iweta nwa oke ehi dịka aja mmehie, duru ya chee ya nʼihu ụlọ nzute.

15Ndị okenye nzukọ Izrel ga-ebikwasị aka ha nʼisi oke ehi ahụ nʼihu Onyenwe anyị. A ga-egbu ehi ahụ nʼihu Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.