13“ ‘Ọ bụrụ na nzukọ Izrel niile emehie na-amaghị ama, mee ihe ọbụla megidere ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu nke a na-adịghị eme eme, ọ bụ ezie na ndị obodo amaghị okwu a, mgbe ha ghọtara ikpe ọmụma ha
14matakwa mmehie ha mehiere, nzukọ ahụ aghaghị iweta nwa oke ehi dịka aja mmehie, duru ya chee ya nʼihu ụlọ nzute.
15Ndị okenye nzukọ Izrel ga-ebikwasị aka ha nʼisi oke ehi ahụ nʼihu Onyenwe anyị. A ga-egbu ehi ahụ nʼihu Onyenwe anyị.
16Mgbe ahụ, onye nchụaja e tere mmanụ ga-ewere ụfọdụ nʼime ọbara ya baa nʼụlọ nzute.
17Ọ ga-edenye mkpịsịaka ya nʼime ọbara ahụ fesa ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu akwa mgbochi ahụ.