15Ndị okenye nzukọ Izrel ga-ebikwasị aka ha nʼisi oke ehi ahụ nʼihu Onyenwe anyị. A ga-egbu ehi ahụ nʼihu Onyenwe anyị.
16Mgbe ahụ, onye nchụaja e tere mmanụ ga-ewere ụfọdụ nʼime ọbara ya baa nʼụlọ nzute.
17Ọ ga-edenye mkpịsịaka ya nʼime ọbara ahụ fesa ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu akwa mgbochi ahụ.
18Ọ ga-ete ọbara ụfọdụ nʼelu mpi nke dị nʼebe ịchụ aja nke dị nʼihu Onyenwe anyị, nʼụlọ nzute. Ọ ga-awụ ọbara nke fọdụrụ nʼụkwụ ala ala, nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
19Ọ ga-ewepụta abụba niile dị ya nʼahụ kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja.