Levitikọs 4

Ọ ga-ewepụta abụba niile dị ya nʼahụ kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja.

Leviticus 4:19 (UKJV) And he shall take all his fat from him, and burn it upon the altar.

17Ọ ga-edenye mkpịsịaka ya nʼime ọbara ahụ fesa ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu akwa mgbochi ahụ.

18Ọ ga-ete ọbara ụfọdụ nʼelu mpi nke dị nʼebe ịchụ aja nke dị nʼihu Onyenwe anyị, nʼụlọ nzute. Ọ ga-awụ ọbara nke fọdụrụ nʼụkwụ ala ala, nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.

19Ọ ga-ewepụta abụba niile dị ya nʼahụ kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja.

20Ọ ga-eme oke ehi ahụ ihe o mere oke ehi aja mmehie. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchi mmehie ndị Izrel. A ga-agbagharakwa ha.

21Emesịa, onye nchụaja ga-eburu ozu oke ehi ahụ gaa nʼazụ obodo kpọọ ya ọkụ nʼebe ahụ, dịka o mere oke ehi nke mbụ. Nke a bụ aja mmehie nʼihi nzukọ Izrel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.