Levitikọs 4

Emesịa, onye nchụaja ga-eburu ozu oke ehi ahụ gaa nʼazụ obodo kpọọ ya ọkụ nʼebe ahụ, dịka o mere oke ehi nke mbụ. Nke a bụ aja mmehie nʼihi nzukọ Izrel.

Leviticus 4:21 (UKJV) And he shall carry forth the bullock without the camp, and burn him as he burned the first bullock: it is a sin offering for the congregation.

19Ọ ga-ewepụta abụba niile dị ya nʼahụ kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja.

20Ọ ga-eme oke ehi ahụ ihe o mere oke ehi aja mmehie. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchi mmehie ndị Izrel. A ga-agbagharakwa ha.

21Emesịa, onye nchụaja ga-eburu ozu oke ehi ahụ gaa nʼazụ obodo kpọọ ya ọkụ nʼebe ahụ, dịka o mere oke ehi nke mbụ. Nke a bụ aja mmehie nʼihi nzukọ Izrel.

22“ ‘Mgbe otu nʼime ndịisi obodo mehiere na-amaghị ama, si otu a megide ihe Onyenwe anyị Chineke nyere nʼiwu banyere ihe a na-agaghị eme, mgbe ọ ghọtara ikpe ọmụma ya.

23Ọ bụrụkwa na-eme ka ọ mata mmehie ya, ọ ghaghị iweta mkpi na-enweghị nkwarụ dịka onyinye nʼihi mmehie ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.