Levitikọs 5

Ha ga-ewere ya bịakwute onye nchụaja, onye ga-ekporo nke ga-eju ya aka ya dịka oke ncheta. Kpọọ ya ọkụ nʼebe ịchụ aja nke onyinye nsure ọkụ e chere nʼihu Onyenwe anyị. Nke a ga-abụkwa aja mmehie ya.

Leviticus 5:12 (UKJV) Then shall he bring it to the priest, and the priest shall take his handful of it, even a memorial thereof, and burn it on the altar, according to the offerings made by fire unto the LORD: it is a sin offering.

10Onye nchụaja ga-eji nnụnụ nke ọzọ chụọ aja nsure ọkụ. Ọ ga-agbaso usoro e debere maka ịchụ aja nsure ọkụ. Ọ ga-ekpuchikwara ha mmehie ha mere. A ga-agbagharakwa ha.

11“ ‘Ọ bụrụ na onye ahụ enweghị ike iweta nduru abụọ, maọbụ kpalakwukwu abụọ, ọ ga-eweta iko ọka asaa a kwọrọ nke ọma ka ọ bụrụ onyinye aja mmehie. Ọ gaghị etinye ya mmanụ oliv na ụda na-esi isi ụtọ, nʼihi na ọ bụ aja mmehie.

12Ha ga-ewere ya bịakwute onye nchụaja, onye ga-ekporo nke ga-eju ya aka ya dịka oke ncheta. Kpọọ ya ọkụ nʼebe ịchụ aja nke onyinye nsure ọkụ e chere nʼihu Onyenwe anyị. Nke a ga-abụkwa aja mmehie ya.

13Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-achụrụ ya aja ikpuchi mmehie ya niile. A ga-agbagharakwa ya. Ụtụ ọka fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja, dịka e si mee ya nʼaja onyinye mkpụrụ ọka.’ ”

14Onyenwe anyị gwara Mosis sị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.