8Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
9“Nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom iwu sị: ‘Ndị a bụ usoro iwu metụtara aja nsure ọkụ. Aja nsure ọkụ ga-adịgide nʼekwu ahụ dị nʼebe ịchụ aja site nʼabalị ruo nʼụtụtụ. A ga-akwanyekwa ọkụ na-adị nʼebe ịchụ aja hapụ ya ka o nwuo abalị niile.
10Mgbe chi bọrọ, onye nchụaja ga-eyiri uwe ime ahụ ya nke akwa ọcha, nakwa uwe elu ahụ ya, gaa kpopu ntụ dị nʼekwu nke ebe ịchụ aja nsure ọkụ ahụ, wụsa ha nʼakụkụ ebe ịchụ aja ahụ.
11Mgbe o mesịrị nke a, ọ ga-agbanwe uwe ya, kporo ntụ ahụ, buru ya pụọ nʼazụ ogige ahụ gaa wufuo ya nʼebe ahụ e mere ka ọ dị ọcha.
12Ọkụ dị nʼebe ịchụ aja ga na-enwu mgbe niile, a gaghị ekwe ka ọ nyụọ. Nʼụtụtụ niile onye nchụaja ga-akwanye ya nkụ ọhụrụ, tụkwasịkwa aja nsure ọkụ nʼelu ya surekwaa abụba aja udo nʼelu ya.