10Mgbe chi bọrọ, onye nchụaja ga-eyiri uwe ime ahụ ya nke akwa ọcha, nakwa uwe elu ahụ ya, gaa kpopu ntụ dị nʼekwu nke ebe ịchụ aja nsure ọkụ ahụ, wụsa ha nʼakụkụ ebe ịchụ aja ahụ.
11Mgbe o mesịrị nke a, ọ ga-agbanwe uwe ya, kporo ntụ ahụ, buru ya pụọ nʼazụ ogige ahụ gaa wufuo ya nʼebe ahụ e mere ka ọ dị ọcha.
12Ọkụ dị nʼebe ịchụ aja ga na-enwu mgbe niile, a gaghị ekwe ka ọ nyụọ. Nʼụtụtụ niile onye nchụaja ga-akwanye ya nkụ ọhụrụ, tụkwasịkwa aja nsure ọkụ nʼelu ya surekwaa abụba aja udo nʼelu ya.
13Ọkụ ga-enwugide nʼebe ịchụ aja mgbe niile. A gaghị ekwe ka ọ nyụọ mgbe ọbụla.’
14“ ‘Ndị a bụ usoro iwu gbasara onyinye mkpụrụ ọka. Ụmụ Erọn ndị ikom ga-eguzo nʼihu ebe ịchụ aja iche ya nʼihu Onyenwe anyị.