Levitikọs 6

Nwoke ọbụla sitere nʼagbụrụ Erọn, onye nchụaja, nwere ike iri ya. Ọ bụ oke ọ ga na-eketa site nʼonyinye nsure ọkụ niile echere nʼihu Onyenwe anyị ruo nʼọgbọ niile na-abịa. Ihe ọbụla metụrụ ha ahụ ga-aghọ ihe dị nsọ.’ ”

Leviticus 6:18 (UKJV) All the males among the children of Aaron shall eat of it. It shall be a statute for ever in your generations concerning the offerings of the LORD made by fire: every one that touches them shall be holy.

16Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri nke fọdụrụnụ. Ma a ga-eri ya na-ejighị ihe na-eko achịcha, nʼime ebe nsọ, nʼogige ụlọ nzute ka a ga-anọ eri ya.

17Agaghị etinye ya ihe na-eko achịcha ma a na-eghe ya. Enyela ya ka ọ bụrụ oke ruuru ha site nʼonyinye nsure ọkụ e chere nʼihu m. Ha bụkwa ihe dịkarịsịrị nsọ, dịka aja ikpe ọmụma na aja mmehie.

18Nwoke ọbụla sitere nʼagbụrụ Erọn, onye nchụaja, nwere ike iri ya. Ọ bụ oke ọ ga na-eketa site nʼonyinye nsure ọkụ niile echere nʼihu Onyenwe anyị ruo nʼọgbọ niile na-abịa. Ihe ọbụla metụrụ ha ahụ ga-aghọ ihe dị nsọ.’ ”

19Onyenwe anyị gwakwara Mosis sị,

20“Nke a bụ aja Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-achụrụ Onyenwe anyị nʼụbọchị a ga-ete ya mmanụ. Ọ ga-abụ ọtụtụ ruru lita abụọ nke ọka dị ezi mma dịka aja onyinye a na-achụ mgbe niile. Ha ga-enye otu ọkara ya nʼụtụtụ, nye nke ọzọ nʼuhuruchi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.