21Ha ga-etinye ya mmanụ, ghee ya nʼite. Ị ga-ebubata ya mgbe a gwọkọrọ ya nke ọma, chee ya dịka aja ọka a nyawasịrị anyawasị nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi mma.
22Nwa nwoke ahụ nke ga-anọchi ya dịka onye nchụaja e tere mmanụ bụ onye ga-akwado ya. Ọ bụ oke ruuru Onyenwe anyị ebighị ebi, bụrụkwa nke a ga-esure ọkụ kpamkpam.
23Onyinye mkpụrụ ọka ọbụla nke onye nchụaja nyere ka a ga-akpọ ọkụ kpamkpam. A gaghị eri ya eri.”
24Onyenwe anyị sịrị Mosis,
25“Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom, sị, ‘Ndị a bụ usoro iwu unu ga-edebe banyere aja mmehie. A ga-egbu anụ aja mmehie nʼihu Onyenwe anyị, nʼebe ahụ a na-egbu anụ aja nsure ọkụ. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.