22Nwa nwoke ahụ nke ga-anọchi ya dịka onye nchụaja e tere mmanụ bụ onye ga-akwado ya. Ọ bụ oke ruuru Onyenwe anyị ebighị ebi, bụrụkwa nke a ga-esure ọkụ kpamkpam.
23Onyinye mkpụrụ ọka ọbụla nke onye nchụaja nyere ka a ga-akpọ ọkụ kpamkpam. A gaghị eri ya eri.”
24Onyenwe anyị sịrị Mosis,
25“Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom, sị, ‘Ndị a bụ usoro iwu unu ga-edebe banyere aja mmehie. A ga-egbu anụ aja mmehie nʼihu Onyenwe anyị, nʼebe ahụ a na-egbu anụ aja nsure ọkụ. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
26Onye nchụaja chụrụ ya ga-eri anụ ya, ọ bụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, ya bụ nʼogige ụlọ nzute ahụ ka a ga-anọ rie ya.