24Onyenwe anyị sịrị Mosis,
25“Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom, sị, ‘Ndị a bụ usoro iwu unu ga-edebe banyere aja mmehie. A ga-egbu anụ aja mmehie nʼihu Onyenwe anyị, nʼebe ahụ a na-egbu anụ aja nsure ọkụ. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
26Onye nchụaja chụrụ ya ga-eri anụ ya, ọ bụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, ya bụ nʼogige ụlọ nzute ahụ ka a ga-anọ rie ya.
27Ihe ọbụla metụrụ anụ nke ọbụla aka, ga-aghọ ihe dị nsọ. Ọ bụrụkwa na ọbara ya efesa nʼuwe ọbụla, ị ga-asụ uwe ahụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ.
28A ghaghị itiwa ite aja e ji sie anụ ahụ. Ọ bụrụkwanụ nʼite bronz ka e siri ya, a ga-asa ite ahụ mmiri nke ọma, saa ya ka ọ dị ezi ọcha.