26Onye nchụaja chụrụ ya ga-eri anụ ya, ọ bụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, ya bụ nʼogige ụlọ nzute ahụ ka a ga-anọ rie ya.
27Ihe ọbụla metụrụ anụ nke ọbụla aka, ga-aghọ ihe dị nsọ. Ọ bụrụkwa na ọbara ya efesa nʼuwe ọbụla, ị ga-asụ uwe ahụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ.
28A ghaghị itiwa ite aja e ji sie anụ ahụ. Ọ bụrụkwanụ nʼite bronz ka e siri ya, a ga-asa ite ahụ mmiri nke ọma, saa ya ka ọ dị ezi ọcha.
29Nwoke ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị nchụaja nwere ike iri anụ ahụ, ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
30Ma a gaghị eri anụ aja mmehie ọbụla, bụ nke e webatara ọbara ya nʼime ụlọ nzute maka ikpuchi mmehie nʼEbe nsọ ahụ. Aghaghị ịkpọ ya ọkụ.