13Ọ ga-ewetakwa onyinye achịcha ọzọ nke e ji ihe na-eko achịcha, ya bụ, yiist mee, tinyere aja udo nke ekele ha.
14Ha ga-esikwa na ya weta otu nʼime onyinye ọbụla, chee nʼihu Onyenwe anyị, dịka onyinye. Ọ bụ nke ndị nchụaja ahụ na-efesa ọbara anụ e ji chụọ aja udo nʼelu ebe ịchụ aja.
15Ma anụ ahụ eji chụọ aja onyinye udo nke ekele, ka a ga-eri nʼotu ụbọchị ahụ e ji ha chụọ aja. O nweghị nke a ga-ahapụ ka ọ bọọ chi.
16“ ‘Ma ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ onyinye afọ ofufu, maọbụ onyinye o wetara nʼihi nkwa o kwere, a ga-eri anụ aja ahụ nʼụbọchị ahụ a chụrụ ya, nweekwa ike rie nke fọdụrụ ma chi bọọ.
17Ma anụ ọbụla fọdụrụ nʼime anụ aja ahụ, nke a na-erichapụghị nʼụbọchị nke abụọ ahụ ka a ga-akpọ ọkụ.