Levitikọs 8

Mgbe ahụ, Mosis weere ụfọdụ nʼime mmanụ nsọ ahụ, na ụfọdụ nʼime ọbara ahụ dị nʼebe ịchụ aja fesa ya Erọn na uwe ya, fesakwa ya ụmụ ndị ikom Erọn nʼuwe ha. Otu a ka o si doo Erọn na uwe ya, na ụmụ ya ndị ikom na uwe ha nsọ.

Leviticus 8:30 (UKJV) And Moses took of the anointing oil, and of the blood which was upon the altar, and sprinkled it upon Aaron, and upon his garments, and upon his sons, and upon his sons' garments with him; and sanctified Aaron, and his garments, and his sons, and his sons' garments with him.

28Mosis naara ya site nʼaka ha, kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja, ya na aja nsure ọkụ, ka ọ bụrụ aja ido nsọ nke isisi ya dị ezi mma, onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.

29Mosis werekwara obi ebule ido nsọ ahụ, fufee ya nʼihu Onyenwe anyị, dịka aja mfufe, dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu. Nke a bụ oke Mosis.

30Mgbe ahụ, Mosis weere ụfọdụ nʼime mmanụ nsọ ahụ, na ụfọdụ nʼime ọbara ahụ dị nʼebe ịchụ aja fesa ya Erọn na uwe ya, fesakwa ya ụmụ ndị ikom Erọn nʼuwe ha. Otu a ka o si doo Erọn na uwe ya, na ụmụ ya ndị ikom na uwe ha nsọ.

31Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn na ụmụ ya ndị ikom sị, “Sienụ anụ ahụ nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Nọrọkwanụ nʼebe ahụ rie ya na achịcha ahụ dị nʼime nkata onyinye ido nsọ, dịka a gwara m, sị, ‘Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri ya.’

32Ihe ọbụla fọdụrụ na anụ ahụ na achịcha ahụ, ka unu ga-akpọ ọkụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.