5Mosis gwara ọgbakọ ahụ sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu ka e mee.”
6Mgbe ahụ, Mosis kpọpụtara Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼihu, jiri mmiri saa ha ahụ.
7O yikwasịrị Erọn uwe ime ahụ, kee ya ihe okike a na-eke nʼukwu, yikwasịkwa ya uwe mwụda na efọọd ahụ, jiri ihe okike ahụ a chọrọ mma kegidesie efọọd ahụ ike nʼahụ ya.
8O tụkwasịrị ya ihe igbochi obi ahụ nʼahụ, tinye Urim na Tumim nʼime ihe igbochi obi ahụ.
9Ọ tụhịkwara akwa ike nʼisi ahụ nʼisi Erọn, tinye nʼihu akwa ike nʼisi ahụ, okpu nsọ e ji ọlaedo kpụọ, nke bụ akara ido nsọ, dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu.