4Mosis mere ihe Onyenwe anyị gwara ya ka o mee. Ọgbakọ ụmụ Izrel zukọtara nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
5Mosis gwara ọgbakọ ahụ sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu ka e mee.”
6Mgbe ahụ, Mosis kpọpụtara Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼihu, jiri mmiri saa ha ahụ.
7O yikwasịrị Erọn uwe ime ahụ, kee ya ihe okike a na-eke nʼukwu, yikwasịkwa ya uwe mwụda na efọọd ahụ, jiri ihe okike ahụ a chọrọ mma kegidesie efọọd ahụ ike nʼahụ ya.
8O tụkwasịrị ya ihe igbochi obi ahụ nʼahụ, tinye Urim na Tumim nʼime ihe igbochi obi ahụ.