Levitikọs 9

Ọ sachara ihe dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya, kpọọ ha ọkụ, dịka aja nsure ọkụ.

Leviticus 9:14 (UKJV) And he did wash the inwards and the legs, and burnt them upon the burnt offering on the altar.

12Emesịa, o gburu anụ e wetara maka aja nsure ọkụ ahụ. Ụmụ ya ndị ikom nyere ya ọbara anụ ahụ, nke o fesara gburugburu ebe ịchụ aja.

13Ha nyefere ya aja nsure ọkụ ahụ nʼaka nʼotu ha sị bọọ ya, tinyere isi ya. Ọ kpọrọ ihe niile ọkụ nʼebe ịchụ aja.

14Ọ sachara ihe dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya, kpọọ ha ọkụ, dịka aja nsure ọkụ.

15Emesịa, Erọn wetara onyinye nke dị maka ndị mmadụ, o were ewu ahụ bụ maka mmehie ndị mmadụ, gbuo ya, were chụọ aja mmehie, dịka o mere nke mbụ.

16Ọ chụkwara aja nsure ọkụ nʼusoro dịka iwu e nyere si dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.