14Ọ sachara ihe dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya, kpọọ ha ọkụ, dịka aja nsure ọkụ.
15Emesịa, Erọn wetara onyinye nke dị maka ndị mmadụ, o were ewu ahụ bụ maka mmehie ndị mmadụ, gbuo ya, were chụọ aja mmehie, dịka o mere nke mbụ.
16Ọ chụkwara aja nsure ọkụ nʼusoro dịka iwu e nyere si dị.
17O webatakwara aja mkpụrụ ọka ahụ, kporo nke juru ya aka, kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja, tinyekwara aja nsure ọkụ nke ụtụtụ ahụ.
18Nʼikpeazụ, o gburu ehi na ebule ahụ, nke bụ aja udo ndị Izrel. Ụmụ Erọn buteere ya ọbara nke o fesara gburugburu ebe ịchụ aja.