Luk 1

Mgbe oge ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ ruru, igwe ndị mmadụ bịara nọ nʼezi na-ekpe ekpere.

Luke 1:10 (UKJV) And the whole multitude of the people were praying without at the time of incense.

8O ruru mgbe ọ bụ ndị otu Zekaraya ga-eje ozi, ọ nọ dịka onye nchụaja na-eje ozi nʼihu Chineke.

9A họpụtara ya site nʼife nza dị ka omenaala ndị nchụaja si dị ka ọ bụrụ ya ga-abanye nʼime ime ụlọnsọ Onyenwe anyị ịchụ aja nsure ọkụ nke e ji ụda na-esi isi ụtọ achụ.

10Mgbe oge ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ ruru, igwe ndị mmadụ bịara nọ nʼezi na-ekpe ekpere.

11Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị, onye guzo nʼaka nri nke ebe ịchụ aja nke ihe na-esi isi ụtọ mere ka ọ hụ ya anya.

12Mgbe Zekaraya hụrụ ya, obi fepụrụ ya, ọ tụkwara oke egwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.