9A họpụtara ya site nʼife nza dị ka omenaala ndị nchụaja si dị ka ọ bụrụ ya ga-abanye nʼime ime ụlọnsọ Onyenwe anyị ịchụ aja nsure ọkụ nke e ji ụda na-esi isi ụtọ achụ.
10Mgbe oge ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ ruru, igwe ndị mmadụ bịara nọ nʼezi na-ekpe ekpere.
11Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị, onye guzo nʼaka nri nke ebe ịchụ aja nke ihe na-esi isi ụtọ mere ka ọ hụ ya anya.
12Mgbe Zekaraya hụrụ ya, obi fepụrụ ya, ọ tụkwara oke egwu.
13Ma mmụọ ozi ahụ gwara ya sị, “Zekaraya atụla egwu, Chineke anụla ekpere gị. Elizabet nwunye gị ga-atụrụ ime mụtara gị nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jọn.