68“Ngọzị dịrị Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel, nʼihi na ọ bịala leta ma gbapụtakwa ndị nke ya.
69O welielara anyị Onye nzọpụta site nʼụlọ odibo ya bụ Devid.
70(Dị ka o kwuru na mgbe ochie, site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ).
71Na ọ ga-azọpụta anyị site nʼaka ndị iro anyị na sitekwa nʼaka ndị niile kpọrọ anyị asị.
72O meere ndị nna nna anyị ha ebere site nʼicheta ọgbụgba ndụ ya dị nsọ.