33Ma otu onye Sameria na-aga njem, mgbe ọ bịarutere nso nʼebe ahụ; hụ ya, o nwere ọmịiko nʼahụ ya.
34Ọ gara nso nʼebe ọ nọ, jiri mmanya na mmanụ wụsa nʼọnya ya, were akwa kechie ya. Ọ tụkwasịrị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buba ya nʼụlọ ndị ije ebe o lekọtara ya anya nke ọma.
35Nʼechi ya, o wepụtara mkpụrụ ego ọlaọcha abụọ nye onye na-elekọta ụlọ ndị ije ahụ sị ya, ‘Lezie ya anya nke ọma. M lọta aga m akwụghachi gị ihe ọbụla ọzọ i mefuru.’
36“Onye nʼime mmadụ atọ ndị a ka i chere bụ onye gosiri onwe ya dị ka onye agbataobi nye nwoke ahụ nke dabara nʼaka ndị ohi?”
37Ọ sịrị, “Ọ bụ onye ahụ meere ya ebere.” Jisọs sịrị ya, “Laa, gaa mee otu ahụ.”