35Nʼechi ya, o wepụtara mkpụrụ ego ọlaọcha abụọ nye onye na-elekọta ụlọ ndị ije ahụ sị ya, ‘Lezie ya anya nke ọma. M lọta aga m akwụghachi gị ihe ọbụla ọzọ i mefuru.’
36“Onye nʼime mmadụ atọ ndị a ka i chere bụ onye gosiri onwe ya dị ka onye agbataobi nye nwoke ahụ nke dabara nʼaka ndị ohi?”
37Ọ sịrị, “Ọ bụ onye ahụ meere ya ebere.” Jisọs sịrị ya, “Laa, gaa mee otu ahụ.”
38Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ banyere nʼotu obodo nta ebe nwanyị a na-akpọ Mata nabatara ya nʼụlọ ya.
39O nwere nwanne nwanyị a na-akpọ Meri nke nọdụrụ ala nʼụkwụ Onyenwe anyị na-ege ntị nʼihe ọ na-ekwu.