31Kama chọọnụ alaeze ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile.
32“Unu atụla egwu, igwe atụrụ nta, nʼihi na ọ tọrọ Nna unu ụtọ inye unu alaeze ahụ.
33Reenụ ihe unu nwere nyekwanụ ndị ogbenye. Meerenụ onwe unu akpa na-agaghị aka nka, nʼọba akụ nʼeluigwe, ebe onye ohi na-adịghị abịa nso, nla adịghị erichapụkwa ya.
34Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.”
35“Keenụ ajị nʼume, meenụ ka oriọna unu na-enwu enwu.